Native Bible

Leviticus 24:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye ọbụla kwuluru aha Onyenwe anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru Aha ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu.

Leviticus 24:16 in English

Leviticus 24:16 · Berean Standard Bible

Whoever blasphemes the name of the LORD must surely be put to death; the whole assembly must surely stone him, whether he is a foreign resident or native; if he blasphemes the Name, he must be put to death.

Context

14“Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ Izrel niile ga-eji nkume tugbuo ya. 15Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara Chineke ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya. 16Onye ọbụla kwuluru aha Onyenwe anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru Aha ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu. 17“ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ka a ga-egbu. 18Onye gburu anụ ụlọ na-abụghị nke ya, ga-akwụghachi ụgwọ ya. Ndụ ga-alara ndụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.