Native Bible

Lamentations 4:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.

Lamentations 4:9 in English

Lamentations 4:9 · Berean Standard Bible

Those slain by the sword are better off than those who die of hunger, who waste away, pierced with pain because the fields lack produce.

Context

7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa. 8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ. 9Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ, ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi. 10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi. 11Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.