Abụ Akwa 4:7
Lamentations 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe, ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi. Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa; ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.
Lamentations 4:7 in English
Lamentations 4:7 · Berean Standard Bible
Her dignitaries were brighter than snow, whiter than milk; their bodies were more ruddy than rubies, their appearance * like sapphires.*
Context
5Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche
tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ.
Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie
nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa. 6Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu
karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm.
Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya.
Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka. 7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,
ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi.
Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa;
ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa. 8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.
A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi.
Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha;
ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ. 9Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma
karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ,
ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ
nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.