Abụ Akwa 4:6
Lamentations 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm. Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya. Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka.
Lamentations 4:6 in English
Lamentations 4:6 · Berean Standard Bible
The punishment * of the daughter of my people is greater than that of Sodom, which was overthrown in an instant without a hand turned to help her.
Context
4Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya
nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri,
ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ. 5Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche
tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ.
Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie
nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa. 6Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu
karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm.
Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya.
Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka. 7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,
ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi.
Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa;
ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa. 8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.
A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi.
Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha;
ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.