Abụ Akwa 4:5
Lamentations 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ. Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa.
Lamentations 4:5 in English
Lamentations 4:5 · Berean Standard Bible
Those who once ate delicacies are destitute in the streets; those brought up in crimson huddle in ash heaps.
Context
3Ọ bụladị ụmụ nkịta ọhịa na-eji ara ha
azụ ụmụ ha,
ma ndị a aghọọla ndị na-enweghị obi ebere;
ha aghọọla enyi nnụnụ nke na-ebi nʼọzara. 4Lee na ire nwa ọhụrụ na-arapara nʼakpo ọnụ ya
nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.
Ụmụntakịrị na-arịọkwa ka e nye ha nri,
ma o nweghị onye na-enye ha nri ahụ. 5Ndị ahụ naara eri ihe ụtọ dị iche iche
tọgbọrọ nʼefu ugbu a nʼokporoụzọ.
Ndị ahụ a zụrụ iyi uwe uhie uhie
nọ ugbu a na-edina nʼebe a na-ekpofu ahịhịa. 6Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu
karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm.
Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya.
Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka. 7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,
ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi.
Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa;
ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.