Abụ Akwa 4:8
Lamentations 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi. A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi. Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha; ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ.
Lamentations 4:8 in English
Lamentations 4:8 · Berean Standard Bible
But now their appearance is blacker than soot; they are not recognized in the streets. Their skin has shriveled on their bones; it has become as dry as a stick.
Context
6Ahụhụ dịịrị ndị m dị ukwuu
karịa ahụhụ nke bịakwasịrị Sọdọm.
Nʼihi na ọ bụ nʼotu ntabi anya ka a kwatụrụ ya.
Ọ dịkwaghị onye bịara nyere ya aka. 7Ụmụ ndị eze ha na-egbuke karịa akụmmiri igwe,
ha na-acha ọcha chakarịa mmiri ara ehi.
Anụ ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ dịka nkume rubi dị oke ọnụahịa;
ha makwara mma ile anya dịka nkume safaia, bụ nkume dị oke ọnụahịa. 8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.
A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi.
Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha;
ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ. 9Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma
karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ,
ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ
nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi. 10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere
ji gbuo ụmụ ha, sie ha.
Ụmụ ha ghọọrọ ha nri
nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.