Abụ Akwa 4:10
Lamentations 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.
Lamentations 4:10 in English
Lamentations 4:10 · Berean Standard Bible
The hands of compassionate women have cooked their own children, who became their food in the destruction of the daughter of my people.
Context
8Ma ugbu a, ha na-eji nji karịa unyi.
A naghị amatakwa ha ma a hụ ha nʼezi.
Anụ ahụ ha araparala nʼọkpụkpụ ha;
ọ kpọnwụọla dịka a ga-asị na ọ bụ osisi kpọrọ nkụ. 9Ọnọdụ ndị e ji mma agha gbuo ka mma
karịa ọnọdụ ndị nwụrụ site nʼụnwụ,
ndị agụụ gụgburu, ndị ji nwayọọ nwayọọ nwụọ
nʼihi nri nke na-adịghị nʼubi. 10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere
ji gbuo ụmụ ha, sie ha.
Ụmụ ha ghọọrọ ha nri
nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi. 11Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè;
ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ.
O sunyela ọkụ na Zayọn,
nke rechapụrụ ntọala ya niile. 12Ndị eze nke ụwa ekwetaghị;
otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị
na ndị iro nwere ike
si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.