Native Bible

Lamentations 4:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem.

Lamentations 4:12 in English

Lamentations 4:12 · Berean Standard Bible

The kings of the earth did not believe, nor any people of the world, that an enemy or a foe could enter the gates of Jerusalem.

Context

10Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi. 11Onyenwe anyị emeela ka nrubiga oke nke iwe ya pụta ìhè; ọ wụpụla iwe ya dị ọkụ. O sunyela ọkụ na Zayọn, nke rechapụrụ ntọala ya niile. 12Ndị eze nke ụwa ekwetaghị; otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị na ndị iro nwere ike si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem. 13Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya, na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya, ndị wụsiri ọbara ndị ezi omume nọ nʼetiti ya. 14Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.