Abụ Akwa 4:14
Lamentations 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile, dịka ndị kpuru ìsì. Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha. O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka.
Lamentations 4:14 in English
Lamentations 4:14 · Berean Standard Bible
They wandered blind in the streets, defiled by this blood, so that no one dared to touch their garments.
Context
12Ndị eze nke ụwa ekwetaghị;
otu a kwa, ndị ụwa niile ekwetakwaghị
na ndị iro nwere ike
si nʼọnụ ụzọ ama banye nʼime Jerusalem. 13Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya,
na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya,
ndị wụsiri ọbara
ndị ezi omume nọ nʼetiti ya. 14Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile,
dịka ndị kpuru ìsì.
Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha.
O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka. 15Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ!
Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!”
Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị,
ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha,
“O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.” 16Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha.
Ọ gaghị agụnyekwa ha.
Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja,
ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.