Abụ Akwa 4:15
Lamentations 4:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ! Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!” Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị, ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha, “O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.”
Lamentations 4:15 in English
Lamentations 4:15 · Berean Standard Bible
“Go away! Unclean!” men shouted at them. “Away, away! Do not touch us!” So they fled and wandered. Among the nations it was said, “They can stay here no longer.”
Context
13Ma ihe ndị a mere nʼihi mmehie ndị amụma ya,
na nʼihi ajọ omume nke ndị nchụaja ya,
ndị wụsiri ọbara
ndị ezi omume nọ nʼetiti ya. 14Ugbu a, ha na-asọ isi nʼokporoụzọ niile,
dịka ndị kpuru ìsì.
Ha ejirila ọbara merụọ onwe ha.
O nwekwaghị onye na-agbalị ịbịaru ha nso ịmetụ uwe ha aka. 15Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ!
Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!”
Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị,
ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha,
“O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.” 16Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha.
Ọ gaghị agụnyekwa ha.
Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja,
ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara. 17Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị,
ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka.
Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya
maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.