Abụ Akwa 4:17
Lamentations 4:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị, ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka. Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị.
Lamentations 4:17 in English
Lamentations 4:17 · Berean Standard Bible
All the while our eyes were failing as we looked in vain for help. We watched from our towers for a nation that could not save us.
Context
15Ndị mmadụ na-eti mkpu na-asị ha, “Sitenụ nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu! Unu rụrụ arụ!
Wezuganụ onwe unu, unu emetụkwala anyị aka!”
Mgbe ha gbapụrụ ọsọ bido na-awagharị,
ndị nọ na mba dị iche iche na-asị ha,
“O kwesighị ka ha nọrọkwa nʼebe a.” 16Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha.
Ọ gaghị agụnyekwa ha.
Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja,
ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara. 17Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị,
ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka.
Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya
maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị. 18Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere,
nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị.
Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị,
tupu ọgwụgwụ anyị eruo. 19Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike
karịa ugo na-efe na mbara eluigwe.
Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile,
nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.