Abụ Akwa 4:19
Lamentations 4:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike karịa ugo na-efe na mbara eluigwe. Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile, nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị.
Lamentations 4:19 in English
Lamentations 4:19 · Berean Standard Bible
Those who chased us were swifter than the eagles in the sky; they pursued us over the mountains and ambushed us in the wilderness.
Context
17Nke ka nke, anya agbaala anyị ọchịchịrị,
ebe anyị nọ na-elepụ anya nʼefu maka enyemaka.
Ọ bụ site nʼụlọ elu nche ka anyị nọ na-elepụ anya, na-ele anya
maka ọbịbịa mba ahụ na-enweghị ike bịa zọpụta anyị. 18Ndị mmadụ na-esogharị anyị ebe niile anyị jere,
nʼihi ya anyị enweghị ike jegharịakwa nʼokporoụzọ anyị.
Ọgwụgwụ anyị adịla nso, a pụkwara ịgụta ụbọchị ole fọdụụrụ anyị,
tupu ọgwụgwụ anyị eruo. 19Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike
karịa ugo na-efe na mbara eluigwe.
Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile,
nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị. 20Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ,
ka ha jidere nʼọnya ha.
Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya,
nʼetiti mba dị iche iche. 21Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm,
onye nke bi nʼala Uz.
Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ.
Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.