Abụ Akwa 4:21
Lamentations 4:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm, onye nke bi nʼala Uz. Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ. Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ.
Lamentations 4:21 in English
Lamentations 4:21 · Berean Standard Bible
So rejoice and be glad, O Daughter of Edom, you who dwell in the land of Uz. Yet the cup will pass to you as well; you will get drunk and expose yourself.
Context
19Ndị na-achụ anyị ọsọ na-agbasi ọsọ ike
karịa ugo na-efe na mbara eluigwe.
Ha chụgharịrị anyị nʼelu ugwu niile,
nọrọkwa nʼọzara zoo onwe ha na-eche anyị. 20Ume ndụ anyị, nke Onyenwe anyị tere mmanụ,
ka ha jidere nʼọnya ha.
Anyị naara eche na anyị ga-ebi nʼokpuru ndo ya,
nʼetiti mba dị iche iche. 21Ṅụrịa ọṅụ, ka obi tọkwaa gị ụtọ, gị ada Edọm,
onye nke bi nʼala Uz.
Ma a ga-emesịakwa nye gị iko ahụ.
Ị ga-esitekwa na ya ṅụọ ihe ọṅụṅụ ṅụjụbiga afọ oke. A ga-agbakwa gị ọtọ. 22Gị ada Zayọn, ahụhụ gị agwụsịala;
Ọ gaghị emekwa ka i jee biri ogologo oge na mba ọzọ.
Kama, ọ ga-ata gị ahụhụ nʼihi mmehie gị, gị, ada Edọm,
kpugheekwa ajọ omume gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.