Native Bible

Lamentations 3:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.

Lamentations 3:7 in English

Lamentations 3:7 · Berean Standard Bible

He has walled me in so I cannot escape; He has weighed me down with chains.

Context

5O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu. 6O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga. 7Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị. 8Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka. 9O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.