Native Bible

Lamentations 3:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.

Lamentations 3:6 in English

Lamentations 3:6 · Berean Standard Bible

He has made me dwell in darkness like those dead for ages.

Context

4O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ. 5O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu. 6O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga. 7Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị. 8Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.