Native Bible

Lamentations 3:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.

Lamentations 3:50 in English

Lamentations 3:50 · Berean Standard Bible

until the LORD looks down from heaven and sees.

Context

48Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi. 49Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị, 50tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ. 51Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m. 52Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.