Native Bible

Lamentations 3:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.

Lamentations 3:29 in English

Lamentations 3:29 · Berean Standard Bible

Let him bury his face in the dust— perhaps there is still hope.

Context

27Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa. 28Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ. 29Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị. 30Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ. 31Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.