Abụ Akwa 3:19
Lamentations 3:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
Lamentations 3:19 in English
Lamentations 3:19 · Berean Standard Bible
Remember my affliction and wandering, the wormwood and the gall.
Context
17Enweghị m udo,
echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. 18Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa.
Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.” 19Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m,
ya na ihe ilu na oluilu. 20Mgbe m na-echeta ya,
obi m na-ada mba nʼime m. 21Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m
nke na-eme ka m nwee olileanya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.