Abụ Akwa 3:18
Lamentations 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
Lamentations 3:18 in English
Lamentations 3:18 · Berean Standard Bible
So I say, “My strength has perished, along with my hope from the LORD.”
Context
16O meela ka m jiri okwute tajisie eze m,
o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m. 17Enweghị m udo,
echezọkwaala m ihe ọganihu bụ. 18Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa.
Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.” 19Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m,
ya na ihe ilu na oluilu. 20Mgbe m na-echeta ya,
obi m na-ada mba nʼime m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.