Abụ Akwa 2:4
Lamentations 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya, dịka onye iro. Dịka onye iro kwa o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya; ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ, nʼelu ụlọ ada Zayọn.
Lamentations 2:4 in English
Lamentations 2:4 · Berean Standard Bible
He has bent His bow like an enemy; His right hand is positioned. Like a foe He has killed all who were pleasing to the eye; He has poured out His wrath like fire on the tent of the Daughter of Zion.
Context
2Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb;
na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ.
O sitela nʼoke iwe ya
dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda.
Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala,
mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ. 3O sitela nʼoke iwe ya
bipụ ike niile Izrel nwere.
O seghachiri aka nri ya,
mgbe ndị iro ha na-abịa nso.
O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb;
si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya. 4O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya,
dịka onye iro.
Dịka onye iro kwa
o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya;
ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ,
nʼelu ụlọ ada Zayọn. 5Onyenwe anyị dị ka onye iro,
o lomichaala Izrel.
O lomichaala ụlọeze ya niile,
bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike.
O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa
mụbaara ada Juda. 6O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige;
o bibiela ebe nzukọ ya niile.
Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ
ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ.
Site nʼoke iwe ya,
ọ jụla eze na onye nchụaja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.