Abụ Akwa 2:5
Lamentations 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị dị ka onye iro, o lomichaala Izrel. O lomichaala ụlọeze ya niile, bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike. O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa mụbaara ada Juda.
Lamentations 2:5 in English
Lamentations 2:5 · Berean Standard Bible
The Lord is like an enemy; He has swallowed up Israel. He has swallowed up all her palaces and destroyed her strongholds. He has multiplied mourning and lamentation for the Daughter of Judah.
Context
3O sitela nʼoke iwe ya
bipụ ike niile Izrel nwere.
O seghachiri aka nri ya,
mgbe ndị iro ha na-abịa nso.
O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb;
si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya. 4O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya,
dịka onye iro.
Dịka onye iro kwa
o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya;
ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ,
nʼelu ụlọ ada Zayọn. 5Onyenwe anyị dị ka onye iro,
o lomichaala Izrel.
O lomichaala ụlọeze ya niile,
bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike.
O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa
mụbaara ada Juda. 6O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige;
o bibiela ebe nzukọ ya niile.
Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ
ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ.
Site nʼoke iwe ya,
ọ jụla eze na onye nchụaja. 7Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya
gbakụta ebe nsọ ya azụ.
O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya
nyefee nʼaka onye iro;
ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị
dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.