Abụ Akwa 2:6
Lamentations 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige; o bibiela ebe nzukọ ya niile. Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ. Site nʼoke iwe ya, ọ jụla eze na onye nchụaja.
Lamentations 2:6 in English
Lamentations 2:6 · Berean Standard Bible
He has laid waste His tabernacle like a garden booth; He has destroyed His place of meeting. The LORD has made Zion forget her appointed feasts and Sabbaths. In His fierce anger He has despised both king and priest.
Context
4O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya,
dịka onye iro.
Dịka onye iro kwa
o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya;
ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ,
nʼelu ụlọ ada Zayọn. 5Onyenwe anyị dị ka onye iro,
o lomichaala Izrel.
O lomichaala ụlọeze ya niile,
bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike.
O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa
mụbaara ada Juda. 6O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige;
o bibiela ebe nzukọ ya niile.
Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ
ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ.
Site nʼoke iwe ya,
ọ jụla eze na onye nchụaja. 7Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya
gbakụta ebe nsọ ya azụ.
O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya
nyefee nʼaka onye iro;
ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị
dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka. 8Onyenwe anyị ekpebiela ibibi
mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu.
O setịpụrụ ihe ọtụtụ;
o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya.
O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ,
meekwa ka ha richapụsịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.