Abụ Akwa 2:8
Lamentations 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị ekpebiela ibibi mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu. O setịpụrụ ihe ọtụtụ; o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya. O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ, meekwa ka ha richapụsịa.
Lamentations 2:8 in English
Lamentations 2:8 · Berean Standard Bible
The LORD determined to destroy the wall of the Daughter of Zion. He stretched out a measuring line and did not withdraw His hand from destroying. He made the ramparts and walls lament; together they waste away.
Context
6O meela ka ebe obibi ya tọgbọrọ nʼefu, dịka ubi a gbara ogige;
o bibiela ebe nzukọ ya niile.
Onyenwe anyị emeela ka Zayọn chezọọ
ime mmemme ya a kara aka, na idebe ụbọchị izuike ọbụla nsọ.
Site nʼoke iwe ya,
ọ jụla eze na onye nchụaja. 7Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya
gbakụta ebe nsọ ya azụ.
O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya
nyefee nʼaka onye iro;
ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị
dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka. 8Onyenwe anyị ekpebiela ibibi
mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu.
O setịpụrụ ihe ọtụtụ;
o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya.
O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ,
meekwa ka ha richapụsịa. 9Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala;
ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi.
A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ.
Iwu adịghịkwa,
otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ
site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 10Ndị okenye ada Zayọn
nọ ọdụ nʼala, dere duu.
Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha;
ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe.
Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke
ehulatala isi ha nʼala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.