Abụ Akwa 2:9
Lamentations 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala; ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi. A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ. Iwu adịghịkwa, otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ site nʼebe Onyenwe anyị nọ.
Lamentations 2:9 in English
Lamentations 2:9 · Berean Standard Bible
Her gates have sunk into the ground; He has destroyed and shattered their bars. Her king and her princes are exiled among the nations, the law is no more, and even her prophets find no vision from the LORD.
Context
7Onyenwe anyị ajụla ebe ịchụ aja ya
gbakụta ebe nsọ ya azụ.
O werela mgbidi niile nke ụlọeze ya
nyefee nʼaka onye iro;
ha emeela ka olu ha daa ụda nʼime ụlọ Onyenwe anyị
dịka nʼụbọchị mmemme a kara aka. 8Onyenwe anyị ekpebiela ibibi
mgbidi gbara ada Zayọn gburugburu.
O setịpụrụ ihe ọtụtụ;
o sepụkwaghị aka ya na ibibi ya.
O mere ka mkputamkpu aja na mgbidi ruo ụjụ,
meekwa ka ha richapụsịa. 9Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala;
ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi.
A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ.
Iwu adịghịkwa,
otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ
site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 10Ndị okenye ada Zayọn
nọ ọdụ nʼala, dere duu.
Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha;
ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe.
Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke
ehulatala isi ha nʼala. 11Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa,
ime ime ahụ m na-anụ ọkụ.
Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala,
nʼihi na e bibiela ndị m,
nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba
nʼokporoụzọ nke obodo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.