Abụ Akwa 2:11
Lamentations 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa, ime ime ahụ m na-anụ ọkụ. Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala, nʼihi na e bibiela ndị m, nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba nʼokporoụzọ nke obodo.
Lamentations 2:11 in English
Lamentations 2:11 · Berean Standard Bible
My eyes fail from weeping; I am churning within. My heart is poured out in grief over the destruction of the daughter of my people, because children and infants faint in the streets of the city.
Context
9Ọnụ ụzọ ama ya niile emikpuola nʼala;
ọ gbajiela mkpọrọ niile e ji akpọchi ha, laakwa ha nʼiyi.
A dọtala eze ya na ụmụ eze ya nʼagha, buru ha jee mba ọzọ.
Iwu adịghịkwa,
otu a, ndị amụma ya enwekwaghị ike ịhụ ọhụ
site nʼebe Onyenwe anyị nọ. 10Ndị okenye ada Zayọn
nọ ọdụ nʼala, dere duu.
Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha;
ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe.
Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke
ehulatala isi ha nʼala. 11Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa,
ime ime ahụ m na-anụ ọkụ.
Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala,
nʼihi na e bibiela ndị m,
nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba
nʼokporoụzọ nke obodo. 12Ha na-ebere nne ha akwa na-asị,
“Olee ebe ọka na mmanya dị?”*
Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ
nʼokporoụzọ obodo,
mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha
nʼaka nne ha ku ha. 13Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị?
Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị,
gị ada Jerusalem?
Gịnị ka m ga-asị na i yiri,
nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi,
gị ada Zayọn na-amaghị nwoke?
Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri.
Onye pụrụ ịgwọ gị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.