Abụ Akwa 2:12
Lamentations 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-ebere nne ha akwa na-asị, “Olee ebe ọka na mmanya dị?”* Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ nʼokporoụzọ obodo, mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha nʼaka nne ha ku ha.
Lamentations 2:12 in English
Lamentations 2:12 · Berean Standard Bible
They cry out to their mothers: “Where is the grain and wine?” as they faint like the wounded in the streets of the city, as their lives fade away in the arms of their mothers.
Context
10Ndị okenye ada Zayọn
nọ ọdụ nʼala, dere duu.
Ha ekpokwasịla aja nʼisi ha;
ha eyikwasịkwala onwe ha uwe mkpe.
Ụmụ agbọghọ Jerusalem na-amaghị nwoke
ehulatala isi ha nʼala. 11Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa,
ime ime ahụ m na-anụ ọkụ.
Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala,
nʼihi na e bibiela ndị m,
nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba
nʼokporoụzọ nke obodo. 12Ha na-ebere nne ha akwa na-asị,
“Olee ebe ọka na mmanya dị?”*
Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ
nʼokporoụzọ obodo,
mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha
nʼaka nne ha ku ha. 13Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị?
Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị,
gị ada Jerusalem?
Gịnị ka m ga-asị na i yiri,
nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi,
gị ada Zayọn na-amaghị nwoke?
Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri.
Onye pụrụ ịgwọ gị? 14Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ
bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi.
Ha ekpugheghị mmehie gị,
igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị.
Kama ihe ha hụtaara gị
bụ ihe ụgha na nduhie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.