Abụ Akwa 2:14
Lamentations 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi. Ha ekpugheghị mmehie gị, igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị. Kama ihe ha hụtaara gị bụ ihe ụgha na nduhie.
Lamentations 2:14 in English
Lamentations 2:14 · Berean Standard Bible
The visions of your prophets were empty and deceptive; they did not expose your guilt to ward off your captivity. The burdens they envisioned for you were empty and misleading.
Context
12Ha na-ebere nne ha akwa na-asị,
“Olee ebe ọka na mmanya dị?”*
Mgbe ha na-ada mba dịka ndị e merụrụ ahụ
nʼokporoụzọ obodo,
mgbe ọnwụ ji nwayọọ na-eripịasị ndụ ha
nʼaka nne ha ku ha. 13Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị?
Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị,
gị ada Jerusalem?
Gịnị ka m ga-asị na i yiri,
nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi,
gị ada Zayọn na-amaghị nwoke?
Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri.
Onye pụrụ ịgwọ gị? 14Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ
bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi.
Ha ekpugheghị mmehie gị,
igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị.
Kama ihe ha hụtaara gị
bụ ihe ụgha na nduhie. 15Ndị niile si nʼebe ị nọ
na-agafe na-akụrụ gị aka ha;
ha na-efufe isi ha,
jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị.
Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ
a na-akpọ ebe mabigara mma oke,
ọṅụ nke ụwa niile?” 16Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha
megide gị;
ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze.
Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya.
Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya.
Anyị adịrịla ndụ hụ ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.