Abụ Akwa 2:15
Lamentations 2:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị niile si nʼebe ị nọ na-agafe na-akụrụ gị aka ha; ha na-efufe isi ha, jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị. Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ a na-akpọ ebe mabigara mma oke, ọṅụ nke ụwa niile?”
Lamentations 2:15 in English
Lamentations 2:15 · Berean Standard Bible
All who pass by clap their hands at you in scorn. They hiss and shake their heads at the Daughter of Jerusalem: “Is this the city that was called the perfection of beauty, the joy of all the earth?”
Context
13Gịnị ka m nwere ike ikwu banyere gị?
Gịnị ka m ga-eji tụnyere gị,
gị ada Jerusalem?
Gịnị ka m ga-asị na i yiri,
nke ga-enyere m aka ịmata otu m ga-esi kasịe gị obi,
gị ada Zayọn na-amaghị nwoke?
Ọnya dị gị nʼahụ miri emi, dịka ịdị omimi nke osimiri.
Onye pụrụ ịgwọ gị? 14Ọhụ niile ndị amụma gị hụrụ
bụ ọhụ ụgha na ọhụ na-enweghị isi.
Ha ekpugheghị mmehie gị,
igbochi ndọta nʼagha nke a dọtara gị.
Kama ihe ha hụtaara gị
bụ ihe ụgha na nduhie. 15Ndị niile si nʼebe ị nọ
na-agafe na-akụrụ gị aka ha;
ha na-efufe isi ha,
jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị.
Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ
a na-akpọ ebe mabigara mma oke,
ọṅụ nke ụwa niile?” 16Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha
megide gị;
ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze.
Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya.
Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya.
Anyị adịrịla ndụ hụ ya.” 17Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime.
O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime
site nʼoge gara aga.
Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla.
O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị;
o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.