Native Bible

Lamentations 2:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị.

Lamentations 2:17 in English

Lamentations 2:17 · Berean Standard Bible

The LORD has done what He planned; He has accomplished His decree, which He ordained in days of old; He has overthrown you without pity. He has let the enemy gloat over you and exalted the horn * of your foes.

Context

15Ndị niile si nʼebe ị nọ na-agafe na-akụrụ gị aka ha; ha na-efufe isi ha, jirikwa ada Jerusalem na-eme ihe ọchị. Ha na-ajụ ajụjụ na-asị, “Nke a ọ bụ obodo ahụ a na-akpọ ebe mabigara mma oke, ọṅụ nke ụwa niile?” 16Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha megide gị; ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze. Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya. Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya. Anyị adịrịla ndụ hụ ya.” 17Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị. 18Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike. 19Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.