Abụ Akwa 2:19
Lamentations 2:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile.
Lamentations 2:19 in English
Lamentations 2:19 · Berean Standard Bible
Arise, cry out in the night from the first watch of the night.* Pour out your heart like water in the presence of the Lord. Lift up your hands to Him for the lives of your children who are fainting from hunger on the corner of every street.
Context
17Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime.
O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime
site nʼoge gara aga.
Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla.
O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị;
o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị. 18Obi ndị mmadụ
na-etiku Onyenwe anyị.
Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn,
ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri
ehihie na abalị niile,
enyekwala onwe gị izuike,
enyekwala anya gị izuike. 19Bilie, kwaa akwa nʼabalị,
nʼoge mmalite nche abalị.
Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị
dịka ọ bụ mmiri.
Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị
nʼihi ụmụntakịrị ndị a,
ndị na-ada nʼihi agụụ
nʼisi okporoụzọ niile. 20“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị.
Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso?
O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha,
bụ ụmụ nke ha mụrụ?
O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma
nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị? 21“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe,
nʼuzuzu nke okporoụzọ.
E jirila mma agha gbuo
ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m.
I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị;
i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.