Native Bible

Lamentations 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike.

Lamentations 2:18 in English

Lamentations 2:18 · Berean Standard Bible

The hearts of the people cry out to the Lord.* O wall of the Daughter of Zion, let your tears run down like a river day and night. Give yourself no relief, and your eyes no rest.

Context

16Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha megide gị; ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze. Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya. Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya. Anyị adịrịla ndụ hụ ya.” 17Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime. O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime site nʼoge gara aga. Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla. O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị; o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị. 18Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike. 19Bilie, kwaa akwa nʼabalị, nʼoge mmalite nche abalị. Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị dịka ọ bụ mmiri. Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị nʼihi ụmụntakịrị ndị a, ndị na-ada nʼihi agụụ nʼisi okporoụzọ niile. 20“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.