Abụ Akwa 2:18
Lamentations 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi ndị mmadụ na-etiku Onyenwe anyị. Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn, ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri ehihie na abalị niile, enyekwala onwe gị izuike, enyekwala anya gị izuike.
Lamentations 2:18 in English
Lamentations 2:18 · Berean Standard Bible
The hearts of the people cry out to the Lord.* O wall of the Daughter of Zion, let your tears run down like a river day and night. Give yourself no relief, and your eyes no rest.
Context
16Ndị iro gị niile na-emeghepụ ọnụ ha
megide gị;
ha na-achị gị ọchị, na-atara gị ikekere eze.
Ha na-ekwu na-asị, “Anyị eloola ya.
Nke a bụ ụbọchị ahụ anyị na-ele anya ya.
Anyị adịrịla ndụ hụ ya.” 17Onyenwe anyị emeela ihe o zubere ime.
O mezuola ihe o kwuru na ọ ghaghị ime
site nʼoge gara aga.
Ọ kwatuola gị, na-enweghị ọmịiko ọbụla.
O meela ka ndị iro gị ṅụrịa ọṅụ nʼahụ gị;
o meekwala ka e bulie ike nke ndị iro gị. 18Obi ndị mmadụ
na-etiku Onyenwe anyị.
Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn,
ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri
ehihie na abalị niile,
enyekwala onwe gị izuike,
enyekwala anya gị izuike. 19Bilie, kwaa akwa nʼabalị,
nʼoge mmalite nche abalị.
Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị
dịka ọ bụ mmiri.
Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị
nʼihi ụmụntakịrị ndị a,
ndị na-ada nʼihi agụụ
nʼisi okporoụzọ niile. 20“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị.
Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso?
O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha,
bụ ụmụ nke ha mụrụ?
O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma
nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.