Abụ Akwa 2:20
Lamentations 2:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị. Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso? O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha, bụ ụmụ nke ha mụrụ? O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị?
Lamentations 2:20 in English
Lamentations 2:20 · Berean Standard Bible
Look, O LORD, and consider: Whom have You ever treated like this? Should women eat their offspring, the infants they have nurtured? Should priests and prophets be killed in the sanctuary of the Lord?
Context
18Obi ndị mmadụ
na-etiku Onyenwe anyị.
Gị, mgbidi niile nke ada Zayọn,
ka anya mmiri gị na-asọpụta dịka osimiri
ehihie na abalị niile,
enyekwala onwe gị izuike,
enyekwala anya gị izuike. 19Bilie, kwaa akwa nʼabalị,
nʼoge mmalite nche abalị.
Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị
dịka ọ bụ mmiri.
Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị
nʼihi ụmụntakịrị ndị a,
ndị na-ada nʼihi agụụ
nʼisi okporoụzọ niile. 20“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị.
Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso?
O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha,
bụ ụmụ nke ha mụrụ?
O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma
nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị? 21“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe,
nʼuzuzu nke okporoụzọ.
E jirila mma agha gbuo
ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m.
I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị;
i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha. 22“Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri,
otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile.
Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị
ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ;
ndị m lekọtara, zụlitekwa
ka ndị iro m lara nʼiyi.”
2:12 Achịcha na ihe ọṅụṅụ dị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.