Abụ Akwa 2:21
Lamentations 2:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe, nʼuzuzu nke okporoụzọ. E jirila mma agha gbuo ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m. I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị; i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha.
Lamentations 2:21 in English
Lamentations 2:21 · Berean Standard Bible
Both young and old lie together in the dust of the streets. My young men and maidens have fallen by the sword. You have slain them in the day of Your anger; You have slaughtered them without compassion.
Context
19Bilie, kwaa akwa nʼabalị,
nʼoge mmalite nche abalị.
Wụpụta ihe dị gị nʼobi nʼihu Onyenwe anyị
dịka ọ bụ mmiri.
Welie aka unu elu nye Onyenwe anyị
nʼihi ụmụntakịrị ndị a,
ndị na-ada nʼihi agụụ
nʼisi okporoụzọ niile. 20“Lee anya, Onyenwe anyị, ma tụgharịa uche gị.
Onye ka i sirila otu a mesoo mmeso?
O kwesiri ka ndị bụ nne rie ụmụ ha,
bụ ụmụ nke ha mụrụ?
O kwesiri ka e gbuo onye nchụaja na onye amụma
nʼime ebe dị nsọ nke Onyenwe anyị? 21“Ụmụ okorobịa na ndị okenye dinakọrọ nʼotu ebe,
nʼuzuzu nke okporoụzọ.
E jirila mma agha gbuo
ụmụ okorobịa m na ụmụ agbọghọ m.
I gbuola ha nʼụbọchị iwe gị;
i gburu ha jụ inwe ọmịiko nʼahụ ha. 22“Dịka i si akpọ oku ka a bịa nʼụbọchị oriri,
otu a ka i si kpọkọta ihe egwu niile ka ha bịakwasị m nʼakụkụ niile.
Nʼụbọchị nke iwe Onyenwe anyị
ọ dịghị onye gbapụrụ ọsọ, ọ dịkwaghị onye fọdụrụ ndụ;
ndị m lekọtara, zụlitekwa
ka ndị iro m lara nʼiyi.”
2:12 Achịcha na ihe ọṅụṅụ dị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.