Abụ Akwa 2:3
Lamentations 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O sitela nʼoke iwe ya bipụ ike niile Izrel nwere. O seghachiri aka nri ya, mgbe ndị iro ha na-abịa nso. O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya.
Lamentations 2:3 in English
Lamentations 2:3 · Berean Standard Bible
In fierce anger He has cut off every horn * of Israel and withdrawn His right hand at the approach of the enemy. He has burned in Jacob like a flaming fire that consumes everything around it.
Context
1Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya
kpuchie ada Zayọn!
O sitela nʼeluigwe
tụda ịma mma Izrel nʼala,
o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya,
nʼụbọchị iwe ya. 2Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb;
na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ.
O sitela nʼoke iwe ya
dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda.
Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala,
mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ. 3O sitela nʼoke iwe ya
bipụ ike niile Izrel nwere.
O seghachiri aka nri ya,
mgbe ndị iro ha na-abịa nso.
O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb;
si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya. 4O kweela ụta ya, jide ya nʼaka nri ya,
dịka onye iro.
Dịka onye iro kwa
o gbuola ndị ahụ niile mara mma ile anya;
ọ wụpụla iwe ya, dịka ọ bụ ọkụ,
nʼelu ụlọ ada Zayọn. 5Onyenwe anyị dị ka onye iro,
o lomichaala Izrel.
O lomichaala ụlọeze ya niile,
bibiekwa ebe ya niile e wusiri ike.
O meela ka iru ụjụ na ịkwa akwa
mụbaara ada Juda.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.