Native Bible

Lamentations 2:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya kpuchie ada Zayọn! O sitela nʼeluigwe tụda ịma mma Izrel nʼala, o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya, nʼụbọchị iwe ya.

Lamentations 2:1 in English

Lamentations 2:1 · Berean Standard Bible

How * the Lord has covered the Daughter of Zion with the cloud of His anger! He has cast the glory of Israel from heaven to earth. He has abandoned His footstool in the day of His anger.

Context

1Lee ka Onyenwe anyị si jiri igwe ojii nke iwe ya kpuchie ada Zayọn! O sitela nʼeluigwe tụda ịma mma Izrel nʼala, o chetakwaghị ebe mgbakwasị ụkwụ ya, nʼụbọchị iwe ya. 2Onyenwe anyị elodala ebe obibi niile nke Jekọb; na-enweghịkwa ọmịiko nʼebe ọ nọ. O sitela nʼoke iwe ya dọdasịa ebe niile e wusiri ike nke ada Juda. Ọ wedala alaeze ya na ndị ụmụ eze ya nʼala, mee ka ha gharakwa ị nwee nsọpụrụ. 3O sitela nʼoke iwe ya bipụ ike niile Izrel nwere. O seghachiri aka nri ya, mgbe ndị iro ha na-abịa nso. O nwukwara dịka ọkụ na-enwusi ike nʼetiti Jekọb; si otu a rechapụ ihe niile dị gburugburu ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.