Juel 2:6
Joel 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu. Ihu ha na-agbarụkwa.
Joel 2:6 in English
Joel 2:6 · Berean Standard Bible
Nations writhe in horror before them; every face turns pale.
Context
4Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya,
ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha. 5Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala
na-arịgo elu ugwu.
Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha. 6Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu.
Ihu ha na-agbarụkwa. 7Ha na-ekwogharị dịka ndị agha;
ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha.
Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị,
na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha. 8Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ.
Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị.
Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha,
ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.