Juel 2:5
Joel 2:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala na-arịgo elu ugwu. Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ. Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.
Joel 2:5 in English
Joel 2:5 · Berean Standard Bible
With a sound like that of chariots they bound over the mountaintops, like the crackling of fire consuming stubble, like a mighty army deployed for battle.
Context
3Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu,
ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ.
Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden,
ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu,
o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha. 4Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya,
ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha. 5Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala
na-arịgo elu ugwu.
Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha. 6Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu.
Ihu ha na-agbarụkwa. 7Ha na-ekwogharị dịka ndị agha;
ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha.
Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị,
na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.