Juel 2:3
Joel 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu, ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ. Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden, ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu, o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha.
Joel 2:3 in English
Joel 2:3 · Berean Standard Bible
Before them a fire devours, and behind them a flame scorches. The land before them is like the Garden of Eden, but behind them, it is like a desert wasteland— surely nothing will escape them.
Context
1Fụọ opi ịdọ aka na ntị na Zayọn.
Ka a nụ ụda opi ịdọ aka na ntị site nʼelu ugwu nsọ m.
Ka ndị niile bi nʼala ahụ maa jijiji,
nʼihi na ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị na-abịa,
ọ na-abịaru nso. 2Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na nke mgbarụ ihu.
Ọ bụ ụbọchị itiri ojii nke oke ọchịchịrị.
Usuu ndị agha dị ike nke ga-ekpuchi elu ugwu niile dịka chi ọbụbọ.
Ha hiri nne, nweekwa ike dị ukwuu.
Ahụbeghị ụdị dịka ha na mbụ,
a gaghị ahụkwa ụdị ha ọzọ ruo ọgbọ niile nke na-abịa. 3Ọkụ na-ere na-aga ha nʼihu,
ire ọkụ na-enwu oke onwunwu dị ha nʼazụ.
Tupu ha abịaruo, ala ahụ na-ama mma dịka ogige nke Iden,
ma nʼazụ ha, ala ubi niile dịka ọzara nke tọgbọrọ nʼefu,
o nweghị ihe ga-agbanarị ịla nʼiyi ha. 4Nʼile anya, ha dịka ịnyịnya,
ha na-ekwogharị dịka ịnyịnya agha. 5Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala
na-arịgo elu ugwu.
Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.