Juel 2:7
Joel 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-ekwogharị dịka ndị agha; ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha. Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị, na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha.
Joel 2:7 in English
Joel 2:7 · Berean Standard Bible
They charge like mighty men; they scale the walls like men of war. Each one marches in formation, not swerving from the course.
Context
5Ha ji ụzụ dịka ụzụ ụgbọala
na-arịgo elu ugwu.
Ụzụ ha dịkwa ka ụzụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ha dịkwa ka ụzụ nke usuu ndị agha dị ike, ndị na-aga ịlụ agha. 6Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu.
Ihu ha na-agbarụkwa. 7Ha na-ekwogharị dịka ndị agha;
ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha.
Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị,
na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha. 8Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ.
Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị.
Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha,
ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị. 9Ha na-enukwasị obodo,
na-agbagharị nʼelu mgbidi,
na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ;
na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.