Juel 2:8
Joel 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ. Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị. Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha, ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị.
Joel 2:8 in English
Joel 2:8 · Berean Standard Bible
They do not jostle one another; each proceeds in his path. They burst through the defenses, never breaking ranks.
Context
6Egwu na-ejide ndị niile ha chere ihu.
Ihu ha na-agbarụkwa. 7Ha na-ekwogharị dịka ndị agha;
ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha.
Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị,
na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha. 8Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ.
Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị.
Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha,
ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị. 9Ha na-enukwasị obodo,
na-agbagharị nʼelu mgbidi,
na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ;
na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile. 10Ala na-ama jijiji nʼihu ha,
eluigwe na-emekwa mkpọtụ.
Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị,
kpakpando adịghịkwa enye ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.