Juel 2:9
Joel 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-enukwasị obodo, na-agbagharị nʼelu mgbidi, na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ; na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile.
Joel 2:9 in English
Joel 2:9 · Berean Standard Bible
They storm the city; they run along the wall; they climb into houses, entering through windows like thieves.
Context
7Ha na-ekwogharị dịka ndị agha;
ha na-arịgo mgbidi dịka ezi ndị agha.
Ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị,
na-ahapụghị onye ọbụla nʼije ha. 8Ọ dịghị onye na-anọchiri ibe ya ụzọ.
Onye ọbụla na-aga nʼihu nʼahịrị nʼahịrị.
Ọ dịghị ngwa agha ọbụla pụrụ ịkwụsị ha,
ka ha na-aga nʼahịrị nʼahịrị. 9Ha na-enukwasị obodo,
na-agbagharị nʼelu mgbidi,
na-arịgo, na-abakwa nʼime ụlọ;
na-abanye dịka ndị ohi site na oghereikuku niile. 10Ala na-ama jijiji nʼihu ha,
eluigwe na-emekwa mkpọtụ.
Ihu anyanwụ na ihu ọnwa na-agbakwa ọchịchịrị,
kpakpando adịghịkwa enye ìhè. 11Olu Onyenwe anyị dara
nʼihu ndị agha,
ndị agha ya dị agụtaghị ọnụ,
ha dịkwa ọtụtụ bụ ndị na-edebe iwu ya.
Ụbọchị ikpe nke Onyenwe anyị dị ukwu
bụrụkwa ihe dị egwu.
Onye pụrụ ịnagide ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.