Juel 2:26
Joel 2:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.
Joel 2:26 in English
Joel 2:26 · Berean Standard Bible
You will have plenty to eat, until you are satisfied. You will praise the name of the LORD your God, who has worked wonders for you. My people will never again be put to shame.
Context
24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka,
ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ. 25“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri,
ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta,
na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri,
bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu. 26Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ,
unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu.
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m. 27Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel.
Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
na ọ dịkwaghị onye ọzọ.
Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ. 28“Ma emesịa,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma.
Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.