Juel 2:28
Joel 2:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ma emesịa, aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m. Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ.
Joel 2:28 in English
Joel 2:28 · Berean Standard Bible
And afterward, I will pour out My Spirit on all people. Your sons and daughters will prophesy, your old men will dream dreams, your young men will see visions.
Context
26Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ,
unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu.
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m. 27Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel.
Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
na ọ dịkwaghị onye ọzọ.
Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ. 28“Ma emesịa,
aga m awụkwasị mmadụ niile Mmụọ m.
Ụmụ unu ndị ikom, na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma.
Ndị okenye nwoke unu ga-arọ nrọ.
Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụ. 29Nʼụbọchị ahụ, aga m awụsa mmụọ m
ọbụladị nʼahụ ndị ohu m ndị nwoke na ndị nwanyị. 30Aga m egosi ihe ebube dị iche iche na mbara eluigwe,
na nʼelu ụwa;
a ga-ahụ ọbara, na ire ọkụ, na ogidi anwụrụ ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.