Juel 2:24
Joel 2:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ.
Joel 2:24 in English
Joel 2:24 · Berean Standard Bible
The threshing floors will be full of grain, and the vats will overflow with new wine and oil.
Context
22Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile,
nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ.
Osisi na-amị mkpụrụ ha,
osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju. 23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ,
ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu.
Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị,
nʼihi ịdị mma ya.
Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo,
nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ. 24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka,
ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ. 25“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri,
ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta,
na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri,
bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu. 26Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ,
unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu.
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.