Native Bible

Joel 2:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu.

Joel 2:25 in English

Joel 2:25 · Berean Standard Bible

I will repay you for the years eaten by locusts— the swarming locust, the young locust, the destroying locust, and the devouring locust *— My great army that I sent against you.

Context

23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ, ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu. Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị, nʼihi ịdị mma ya. Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo, nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ. 24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka, ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ. 25“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu. 26Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ, unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m. 27Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel. Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu, na ọ dịkwaghị onye ọzọ. Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.