Juel 2:25
Joel 2:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri, ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta, na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri, bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu.
Joel 2:25 in English
Joel 2:25 · Berean Standard Bible
I will repay you for the years eaten by locusts— the swarming locust, the young locust, the destroying locust, and the devouring locust *— My great army that I sent against you.
Context
23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ,
ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu.
Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị,
nʼihi ịdị mma ya.
Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo,
nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ. 24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka,
ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ. 25“Aga m enyeghachi afọ niile nke igurube riri,
ndị ahụ nke igurube ukwu na igurube nta,
na ụkpana, na ndị mbibi ọzọ riri,
bụ usuu ndị agha ahụ m zitere nʼetiti unu. 26Unu ga-eri ka unu siri chọọ, rijuchaa afọ,
unu ga-etokwa Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
onye rụrụ ọrụ ebube ndị a nʼihi unu.
Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ihere ga-eme ndị m. 27Mgbe ahụ unu ga-amata na m nọ nʼebe a nʼetiti ndị m Izrel.
Unu ga-amatakwa na naanị m bụ Onyenwe anyị bụ Chineke unu,
na ọ dịkwaghị onye ọzọ.
Ihere agaghị emekwa ndị m ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.