Juel 2:22
Joel 2:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile, nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ. Osisi na-amị mkpụrụ ha, osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju.
Joel 2:22 in English
Joel 2:22 · Berean Standard Bible
Do not be afraid, O beasts of the field, for the open pastures have turned green, the trees bear their fruit, and the fig tree and vine yield their best.*
Context
20“Aga m ewezuga ndị agha ahụ si nʼugwu, zipụ ha nʼebe tere anya,
m ga-achụba ha nʼala kpọrọ nkụ, na ebe tọgbọrọ nʼefu.
Ndị nọ nʼihu ga-erugbu nʼosimiri Nnu dị nʼọwụwa anyanwụ;
ndị nọ nʼazụ ka m ga-erugbu nʼosimiri Mediterenịa dị nʼọdịda anyanwụ.
Isisi ọjọọ ya ga-esipụta,
isisi nke ure ya ga-arịgokwa.”
Nʼezie, ọ meela ihe ndị dị ukwuu dị iche iche. 21Atụkwala egwu, gị ala Juda,
kama ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ,
nʼezie, Onyenwe anyị arụọla ọrụ dị ịtụnanya. 22Atụla egwu, unu anụ ọhịa niile,
nʼihi na ebe ịta nri unu ga-ejupụtakwa nʼahịhịa ndụ.
Osisi na-amị mkpụrụ ha,
osisi fiig, na osisi vaịnị na-amịkwa mkpụrụ nʼuju. 23Ụmụ Zayọn, ka obi tọọ unu ụtọ,
ṅụrịanụ ọṅụ nʼime ịdị mma Onyenwe anyị, bụ Chineke unu.
Nʼihi na o nyela unu mmiri ozuzo mbụ nke ọkọchị,
nʼihi ịdị mma ya.
Ọ na-ezite ọtụtụ mmiri ozuzo,
nke ọkọchị, na nke udu mmiri, dịka ọ dị na mbụ. 24Ebe ịzọcha ọka gị niile ga-ejupụtakwa na mkpụrụ ọka,
ebe ịnara mmanya gị niile ga-ejubiga oke na mmanya na mmanụ ọhụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.