Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Mgbe ahụ, Job zara sị: 2“A sịkwarị na a pụrụ ịtụ ihe mgbu m
ya na nhụju anya m niile nʼelu nʼihe ọtụtụ! 3Ọ ghaghị ịdị arọ karịa aja dị nʼọnụ mmiri ọtụtụ osimiri,
nke mere okwu m ji ada ike ike. 4Àkụ Onye pụrụ ime ihe niile gbara dị nʼime m;
mmụọ m na-aṅụkwa nsi dị na ha;
ihe egwu Chineke edoola onwe ha nʼusoro imegide m. 5Ịnyịnya ibu ọhịa ọ na-akwa akwa mgbe o nwere ahịhịa ọ na-ata,
ka oke ehi ọ na-akwa akwa mgbe ihe oriri ya dị? 6A na-eri nri na-adịghị ụtọ ma e etinyeghị ya nnu,
ka o nwere ụtọ dị na eso ọkwụrụ? 7A jụrụ m ịmetụ ya aka,
nʼihi na nri dị otu a na-eme ka m daa ọrịa. 8“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,
na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya. 9Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m
ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m. 10Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a,
wụlikwaa elu* nʼime ihe mgbu na-adịgide,
na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ. 11“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ?
Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi? 12Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume?
Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz? 13Ọ ga-abụ na m nwere ike inyere onwe m aka,
ugbu a, e siterela nʼebe m nọ wezuga nzube? 14“Onye ọbụla nʼejichi ebere site nʼebe enyi ya nọ
na-agbakụta egwu Onye pụrụ ime ihe niile azụ. 15Ma ụmụnna m bụ ndị a na-ekwesighị ịdabere na ha,
dịka iyi mmiri na-akọ, dịka iyi nke na-etofe ọnụ ya, 16nke na-eji ojii nʼihi mkpụrụ mmiri oyi,
nke unyi jupụtara nʼihi mgbaze nke mkpụrụ mmiri oyi. 17Nke na-akwụsị ịsọpụta nʼoge ọkọchị,
nke na-ata ata nʼihi okpomọkụ. 18Ndị ije na-atụgharị site nʼokporoụzọ ije ha.
Ha na-arịgo nʼala akọrọ si otu a laa nʼiyi. 19Ndị ije si Tema na-ele anya mmiri,
otu a kwa ndị ahịa Sheba na-ele anya nʼolileanya. 20Obi mgbu na-ejide ha nʼihi na ha nwere ntụkwasị obi,
ha bịarutere ebe ahụ, bụrụ ndị emenyere ihere. 21Ma ugbu a, unu egosila na unu abaghị uru,
unu ahụla ihe na-eyi egwu ma ụjọ ejidela unu. 22O nweela mgbe m sịrị unu, ‘Nyenụ ihe ọbụla nʼọnọdụ m,
sitenụ nʼakụnụba unu kwụọ ụgwọ ịgbapụta m, 23gbapụtanụ m nʼaka ndị iro,
maọbụ napụtanụ m nʼaka ndị na-enweghị obi ebere’? 24“Zienụ m ihe ga-eme ka m mechie ọnụ,
gosi m ebe m si mejọọ. 25Eziokwu na-egbu mgbu nʼobi!
Ma gịnị ka ịrụ ụka unu na-ewepụta? 26Ị chọrọ idozi okwu ọnụ m?
Si otu a mee ka okwu onye ike gwụrụ ghọọ ikuku efu? 27Unu nwere ike ife nza nʼisi onye na-enweghị nna,
ma refukwaa enyi unu. 28“Lezie m anya nke ọma,
ọ dị unu ka m nwere ike ilegide unu anya gwa unu okwu ụgha? 29Kwụsịnụ ihe unu na-eme. Unu abụla ndị na-eme ihe na-ezighị ezi,
tuleenụ ihe unu na-eme, nʼihi na ezi omume m ka guzosiri ike. 30Ọ dị ihe ọjọọ si nʼegbugbere ọnụ m abụọ pụta?
Ọ bụ na ọnụ m apụghị ịchọpụta nzube iro?
6:10 Maọbụ, nwekwa ọṅụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.