Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu* nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.

Job 6:10 in English

Job 6:10 · Berean Standard Bible

It still brings me comfort, and joy through unrelenting pain, that I have not denied the words of the Holy One.

Context

8“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ, na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya. 9Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m. 10Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu* nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ. 11“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ? Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi? 12Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume? Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.