Job 6:10
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a, wụlikwaa elu* nʼime ihe mgbu na-adịgide, na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ.
Job 6:10 in English
Job 6:10 · Berean Standard Bible
It still brings me comfort, and joy through unrelenting pain, that I have not denied the words of the Holy One.
Context
8“O, asị nnọọ na a ga-emere m ihe m na-arịọ,
na Chineke ga-enye m ihe m na-atụ anya ya. 9Ọbụladị ka Chineke kwe igwepịa m
ka ọ tọpụ aka ya, bipụ ndụ m. 10Mgbe ahụ, aga m enwe nkasiobi a,
wụlikwaa elu* nʼime ihe mgbu na-adịgide,
na o nwebeghị oge ọbụla m gọnarịrị okwu nke Onye ahụ dị nsọ. 11“Ike gịnị ka m nwere, na m ga-anọgide na-enwe olileanya ndụ?
Ọganihu gịnị dị, na m na-anọgide na-enwe ndidi? 12Ọ ga-abụ na m nwere ike nkume?
Ka anụ ahụ m ọ bụ bronz?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.