Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile.

Job 5:8 in English

Job 5:8 · Berean Standard Bible

However, if I were you, I would appeal to God and lay my cause before Him—

Context

6Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta, ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite. 7Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu,* dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu. 8“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile. 9Nʼihi na Chineke na-arụ ọrụ ịtụnanya karịrị nghọta, ọrụ ebube nke a na-apụghị ịgụta ọnụ. 10Ọ bụ ya na-enye elu ụwa mmiri ozuzo, ma na-ezigakwa mmiri nʼubi niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.