Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta, ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite.

Job 5:6 in English

Job 5:6 · Berean Standard Bible

For distress does not spring from the dust, and trouble does not sprout from the ground.

Context

4Ụmụ ya na-anọpụ anya site nʼebe nchebe dị, a na-azọpịa ha nʼọnụ ụzọ ama, ọ dịkwaghị onye na-anapụta ha. 5Onye agụụ na-agụ na-eripịa ihe o wetara nʼubi; ọ na-ewere ihe ubi ndị a ọ bụladị site nʼetiti ogwu; akụnụba ya ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ga-achụso. 6Nʼihi na ọnọdụ ọjọọ adịghị esite nʼala pupụta, ma ọ bụkwanụ nsogbu adịghịkwa esite nʼala walite. 7Kama, a mụrụ mmadụ nye nsogbu,* dịka ire ọkụ si esite nʼọkụ a kwanyere na-amali elu. 8“Ma ọ bụrụ na m bụ gị, m ga-ekpesara Chineke; ya ka m ga-akọsara ihe niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.